Luke 3

Nkwusa nke Jọn omee baptizim

1Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin, 2mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara. 3Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 4Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị,

“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị,
‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,
meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
5A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla,
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala.
Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma,
meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.
6Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ” a
7Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 9Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.”

10Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”

11Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”

12Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?”

13Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.”

14Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?”

Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”

15Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ. 16Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. 17Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 18O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.

19Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere, 20tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ.

Baptizim na usoro ndị agbụrụ Jisọs

21Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. 22Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”

23Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef,

onye bụ nwa Heli;
24Heli abụrụ nwa Matat,
nwa Livayị, nwa Meliki,
nwa Janayi, nwa Josef;
25nwa Matatiyas, nwa Emọs,
nwa Nehum, nwa Esili,
nwa Nagayị;
26nwa Maat,
nwa Matatiyas, nwa Semein,
nwa Josek, nwa Joda;
27nwa Joanan, nwa Resa,
nwa Zerubabel, nwa Shealtiel,
nwa Neri;
28nwa Meliki,
nwa Adi, nwa Kosam,
nwa Elmadam, nwa Er,
29nwa Joshua, nwa Elieza,
nwa Jorim, nwa Matat,
nwa Livayị;
30nwa Simiọn,
nwa Juda, nwa Josef,
nwa Jonam, nwa Eliakịm;
31nwa Melea, nwa Mena,
nwa Matata, nwa Netan,
nwa Devid;
32nwa Jesi,
nwa Obed, nwa Boaz,
nwa Salmọn, nwa Nashọn;
33nwa Aminadab, nwa Ram,
Nʼakwụkwọ ụfọdụ i nwere ike ihu nwa Admin, nwa Anai.

nwa Hezrọn, nwa Perez,
nwa Juda;
34nwa Jekọb,
nwa Aịzik, nwa Ebraham,
nwa Tera, nwa Nahọ;
35nwa Serug, nwa Reu,
nwa Peleg, nwa Eba,
nwa Shela;
36nwa Kenan,
nwa Aafaksad, nwa Shem,
nwa Noa, nwa Lamek;
37nwa Metusela, nwa Enọk,
nwa Jared, nwa Mahalalel,
nwa Kenan;
38nwa Enọsh,
nwa Set, nwa Adam,
nwa Chineke.
Copyright information for IboBIU